22 Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.
23 Lemek we si ndinyom-ya:Eda na Zila, nurunu olum;Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum:N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam,Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim:
24 Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀,Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa.
25 Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N'ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n'ọnọdu Ebel; n'ihi na Ken b͕uru ya.
26 Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.