23 Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n'akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha.
24 Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo.
25 Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n'etiti-ehihie: n'ihi na ha nuru na ọ bu n'ebe ahu ka ha gēri nri.
26 Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.
27 Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n'udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu?
28 Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala.
29 Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam.