16 Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya.
17 Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo.
18 Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n'aru orù-gi: n'ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa.
19 Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne?
20 Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya.
21 I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya.
22 Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu.