21 I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya.
22 Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu.
23 I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli.
24 O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem.
25 Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri.
26 Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n'ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je.
27 Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem: