5 Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi:
6 ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.
7 Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.
8 Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole?
9 Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.
10 Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua.
11 Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu.