2 Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob;Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
3 Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem;Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.
4 I nāb͕oghari dika miri, akarila akari;N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi:Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem.
5 Simeon na Livai bu nwa-nne;Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha.
6 Abala n'ìzù-ha, nkpuru-obim;Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum;N'ihi na n'iwe-ha ka ha b͕uru nwoke,Ọ bu kwa n'ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi.
7 Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike;Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike:M'gēkesa ha nime Jekob,B͕asa kwa ha n'Israel.
8 Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi:Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi;Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.