28 Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.
29 Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het,
30 n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì:
31 n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia:
32 azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het.
33 Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.