24 Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.
25 Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:
26 Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
27 ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua.
28 Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke:
29 ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu.
30 Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: