19 Ma osisi nke fọduru n'oké ọhia-ya gādi ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, nwata gēdeta kwa ha n'akwukwọ.
20 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu.
21 Ndi fọduru gālaghachikute Chineke Nke bu dike, bú ndi Jekob fọduru.
22 N'ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n'ezi omume.
23 N'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēme n'etiti uwa nile.
24 N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.
25 N'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, oké iwe ewe gwusia, iwem gēme kwa ka ha ka nká.