Aisaia 64 IGBOB

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;

2 dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n'iru Gi ma jijiji.

3 Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n'iru-Gi rùda dika miri.

4 Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu.

5 I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n'uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi?

6 Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.

7 Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.

8 Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.

9 Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.

10 Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n'efu.

11 Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe.

12 Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n'ala nke-uku?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66