Aisaia 6 IGBOB

1 N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.

2 Ndi-seraph nēguzo n'elu ya: nkù isi nkù isi ka seraph ọ bula nime ha nwere; abua ka o ji ekpuchi iru-ya, abua ka o ji ekpuchi ukwu-ya abua, abua ka o ji efe efe.

3 Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.

4 Ntọ-ala nile nke nbata-uzọ nile we me nkpatu site n'olu onye ahu nke nākpọ òkù, ulo we juputa n'anwuru-ọku.

5 M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.

6 Otù nime ndi-seraph we fekutem, jide otù nkume di ọku n'aka-ya, nke o ji nkpa weputa n'elu ebe-ichu-àjà:

7 o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.

8 M'we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M'gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M'we si, Lem; zigam.

9 O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala.

10 Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.

11 M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,

12 rue mb͕e Jehova meworo ka madu je n'ebe di anya, o we rie nne, bú ebe arapuru arapu n'etiti ala ahu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66