Aisaia 28 IGBOB

1 Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!

2 Le, otù onye di ike nke nwere ume ka Onye-nwe-ayi nwere; dika oké miri-ozuzo nke ákú-miri-ígwé, dika oké ifufe nke nēfechapu efechapu, dika oké miri-ozuzo nke miri di ike nērubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe-ike tọb͕o ihe n'ala.

3 N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:

4 okoko-ọhia nke nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù, gādi kwa ka nkpuru-fig buru uzọ cha tutu mb͕e okpom-ọku erue; nke mb͕e onye ọ bula nke nāhu ya anya nāhu, mb͕e ọ nādi n'ọbu-aka-ya o lo ya.

5 N'ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma:

6 Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.

7 Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.

8 N'ihi na table nile juputara n'ihe-ọb͕ub͕ọ ruru inyi, ọ dighi ebe di ọcha.

9 Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara?

10 N'ihi na ọ bu ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī n'ebe a, nwantī n'ebe ahu.

11 N'ezie site n'isu-nsu nke eb͕ub͕ere-ọnu na site n'ire di iche ka Ọ gāgwa ndi nka okwu:

12 bú Onye siri ha, Nka bu izu-ike ahu, menu ka onye ike gwuru zuru ike; nka bu kwa igba ume ahu: ma ha ekweghi inu.

13 Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha.

14 N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:

15 N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:

16 n'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga.

17 M'gēme kwa ka ikpé buru eriri, me kwa ka ezi omume buru ihe-ọtùtù: ákú-miri-ígwé ewe kpochapu ebe-nb͕abà nke okwu-agha, miri gēruchapu kwa ebe-nzuzo.

18 Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda.

19 Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.

20 N'ihi na ihe-ndina di nkpunkpu kari nke madu gēsetipusi onwe-ya n'elu ya; ákwà-nkpuchi di kwa warara kari nke madu gāfuchi onwe-ya.

21 N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.

22 Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile.

23 Genu nti, nu kwa olum; ṅanu nti, nu kwa okwu-ọnum.

24 Ọ̀ bu ubọchi nile ka onye-plough nēgwu ala igha nkpuru? ọ̀ bu ubọchi nile ka ọ nēgwughe nēme ka ala-ubi-ya di lari?

25 Ọ buru na o mewo ka iru-ya di lari, ọ̀ dighi-aghasa fitch, gha cummin, kua ọka wheat n'ahiri, gha ọka barley n'ebe akara àkà, gha ọka spelt n'ókè-ala-ya?

26 N'ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe.

27 N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.

28 Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n'elu-ya; ọ dighi-asupia ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66