Aisaia 54 IGBOB

1 Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.

2 Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.

3 N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.

4 Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.

5 N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.

6 N'ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri.

7 N'otù ntabi-anya di ntà ka M'rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M'gēji chikọta gi.

8 Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.

9 N'ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n'ihi na dika M'ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M'ṅuworo iyi, si na M'gaghi-ewesa gi iwe, na M'gaghi-abasiri gi nba ike.

10 N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova.

11 Gi nwanyi ewedara n'ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n'ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi.

12 M'gēme kwa ka elu akuku ulo-gi nile ghọ nkume ruby, me kwa ka ọnu-uzọ-ama-gi nile ghọ nkume carbuncle, me kwa ka ókè-ala-gi nile ghọ nkume di iche iche anāchọsi ike.

13 Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.

14 N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.

15 Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n'ebe i nọ gāda ada n'ihi gi.

16 Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi.

17 Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66