Aisaia 21 IGBOB

1 Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.

2 Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.

3 N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ.

4 Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m'tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji.

5 Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu.

6 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi:

7 ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku.

8 O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile:

9 ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.

10 Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.

11 Ibu eboro Duma.Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali?

12 Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.

13 Ibu ebero Arebia.N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.

14 Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n'ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari.

15 N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu.

16 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66