Aisaia 3 IGBOB

1 N'ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n'aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri;

2 dike, na onye-agha; na onye-ikpe, na onye-amuma, na onye nāju ase, na okenye;

3 onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri, na onye anāhu iru-ọma, na onye-ndum-ọdu, na onye mara ihe n'etiti ndi-ọ̀kà, na onye-nghọta n'irà urà.

4 M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.

5 Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.

6 Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n'ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n'okpuru aka-gi:

7 ọ gēweli olu-ya n'ubọchi ahu, si, M'gaghi-abu onye-nkechi; n'ihi na ọ dighi nri di n'ulom, ọ dighi kwa uwe-nb͕okwasi: unu agaghi-edom onye-ikpe ndi-ayi.

8 N'ihi na Jerusalem asuwo ngọngọ, Juda adawo kwa: n'ihi na ire-ha na omume-ha nile nēmegide Jehova, inupu isi n'okpuru anya abua nke ebube-Ya.

9 Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.

10 Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n'ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri.

11 Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.

12 Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.

13 Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche.

14 Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:

15 gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.

16 Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:

17 n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.

18 N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;

19 na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;

20 na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru;

21 na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile;

22 na uwe ememe nile, na uwe-nwuda nile, na ákwà-nb͕okwasi nile, na akpa nile;

23 na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n'isi, na ákwà-nb͕ochi nile.

24 Ọ gēru kwa, na n'ọnọdu uda ọma ire-ure gādi; n'ọnọdu ihe ike n'úkwù udọ̀ gādi; n'ọnọdu agiri-isi akpara nke-ọma nkwọcha-isi gādi; n'ọnọdu ákwà ọma ihe-ọkiké nke ákwà-nkpe gādi: eb͕ub͕u-ọku gādi n'ọnọdu ima-nma.

25 Ndikom-i gāda site na mma-agha, idi-ike-gi nile gāda kwa n'agha.

26 Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66