Aisaia 43 IGBOB

1 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.

2 Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.

3 N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi.

4 Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n'anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n'anya; ya mere M'gēnye madu n'ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n'ọnọdu ndu-gi.

5 Atula egwu; n'ihi na gi ka M'nọyere: M'gēme ka nkpuru-gi si n'Ọwuwa-anyanwu bia, M'gēsi kwa n'Ọdida-anyanwu chikọta gi;

6 M'gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n'ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia;

7 onye ọ bula nke anākpọ n'aham, nke M'kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya.

8 Me ka ndi kpuru ìsì nwere anya abua puta, ha na ndi nti chiri ma ha nwere nti.

9 Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.

10 Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.

11 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.

12 Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n'etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke.

13 Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?

14 Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.

15 Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu.

16 Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;

17 Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:

18 Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi.

19 Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.

20 Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara:

21 ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.

22 Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.

23 I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.

24 I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M'fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum.

25 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.

26 Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.

27 Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.

28 M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66