Aisaia 17 IGBOB

1 Ibu eboro Damaskọs.Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.

2 Arapuwo obodo nile nke Aroea, ìgwè di iche iche aturu ka ha gādiri, nke gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.

3 Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.

5 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye nēwe ihe ubi nēkpokọta ọka guzo ọtọ, ogwe-aka-ya anēwe oko ọka; ọ gādi kwa ka mb͕e anāchikọta oko ọka dara ada na ndagwurugwu Refaim.

6 Ma nkpuru nke fọduru itutukọ gāfọdu nime ya, dika ntisisi nke osisi olive, nkpuru abua ma-ọbu atọ n'elu ngalaba osisi kachasi elu, anọ ma ọbu ise n'alaka-ya nile, bú nke osisi nāmi nkpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta.

7 N'ubọchi ahu ka madu gēle Onye kèworo ya anya ọma, anya-ya abua gēlekwasi kwa Onye Nsọ nke Israel.

8 Ma ọ gaghi-ele ebe-ichu-àjà ahu nile anya ọma, bú ọlu aka-ya, ọ bughi kwa ihe nkpisi-aka-ya meworo ka ọ gēle anya, ma ọ bu Asherim, ma-ọbu arusi-anyanwu-ya nile.

9 N'ubọchi ahu obodo-ya nile nke siri ike gādi ka ebe arapuru arapu nke oké ọhia na nke elu ugwu, nke ha rapuru n'iru umu Israel: ọ gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu.

10 N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:

11 n'ubọchi ọkukú-gi i nāb͕a ya ogige buruburu, ọ bu kwa n'ututu ka i nēme ka nkpuru-gi ma ifuru: ma obo-ihe ka owuwe-ihe-ubi gābu n'ubọchi ọria na ihe-nb͕u nādighi-agwọta.

12 Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.

13 Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66