Aisaia 63 IGBOB

1 Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.

2 Gini mere ọ nācha uhie uhie n'uwe-oyiyi-Gi? gini mere uwe-Gi ji di ka onye nāzọ ukwu n'ebe-inara-manya-vine?

3 Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru.

4 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n'obim, arọ nke ndi M'b͕aputaworo abiawo kwa.

5 M'we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n'aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.

6 M'we zọda ndi di iche iche n'iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n'anya n'ọnumam, M'we me ka ọbara-ndu-ha ruda n'ala.

7 Ebere nile nke Jehova ka M'gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di.

8 O we si, N'ezie, ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: O we ghọrọ ha onye-nzọputa.

9 Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

10 Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha.

11 Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha?

12 Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?

13 Nke nēme ka ha je ije n'ob͕u-miri dika inyinya n'ọzara, ha we ghara isu ngọngọ?

14 Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma.

15 Si n'elu-igwe legide anya, si kwa n'ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n'ebe m'nọ jisiri onwe-ha ike.

16 N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.

17 Jehova, n'ìhi gini ka I nēme ka ayi si n'uzọ-Gi nile kpafue? n'ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n'egwu-Gi sie ike? Lata n'ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.

18 Ọ bu nání mb͕e ntà ka ndi nsọ Gi nwetara ya: ndi nākpab͕u ayi azọdawo ebe nsọ Gi.

19 Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66