Aisaia 47 IGBOB

1 Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.

2 Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.

3 Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.

4 Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel.

5 Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.

6 Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.

7 I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.

8 Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m'gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m'gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu:

9 ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.

10 I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem.

11 Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.

12 Biko, guzo n'ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n'ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji.

13 Ike agwuwo gi n'ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n'ihe gābiakwasi gi.

14 Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n'aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n'iru ya.

15 Otú a ka ha diri gi, bú ihe nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha: ndi gi na ha nāzu ahia site na mb͕e i di na nwata awaghariwo, onye ọ bula rue ofè nke ya; ọ dighi onye nāzọputa gi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66