Aisaia 42 IGBOB

1 Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o

2 Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n'èzí.

3 Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n'ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta.

4 Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.

5 Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:

6 Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;

7 imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye-nkpọrọ si n'ebe emechibidoworo ya puta, ime ka ndi nānọdu n'ọchichiri si n'ulo-nkpọrọ puta.

8 Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M'gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom.

9 Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.

10 Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.

11 Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.

12 Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.

13 Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.

14 Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.

15 M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.

16 M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.

17 Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.

18 Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ.

19 Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M'nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n'udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova?

20 I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe.

21 Ọ tọrọ Jehova utọ, n'ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube.

22 Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.

23 Ònye n'etiti unu gēge nti na nka? ònye gāṅa nti, we nu ihe n'ọdi-n'iru?

24 Ònye were Jekob nye ka ọ ghọ ihe apunaraworo madu, were Israel nye ndi nāluta ihe n'agha? ọ̀ bughi Jehova? bú Onye ayi mehieworo megide, Onye ha nēkweghi kwa eje ije n'uzọ-Ya nile, ha egeghi kwa nti iwu-Ya.

25 O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66