Aisaia 13 IGBOB

1 Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.

2 Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.

3 Mu onwem enyewo ndim edoworo nsọ iwu, akpọwokwam ndi-dikem imezu ihe iwem chọrọ, bú ndim nāṅuri ọṅu-agha nime npako.

4 Nuru olu ìgwè n'ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha.

5 Ha nēsi n'ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile.

6 kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

7 N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:

8 ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.

9 Le, ubọchi Jehova, bú ubọchi nēnweghi obi-ebere, nābia, ya na nrubiga-ókè nke iwe na iwe di ọku; ime ka ala nka ghọ ebe tọbọrọ n'efu na ikpochapu ndi-nmehie nime ya.

10 N'ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n'ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie.

11 M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.

12 M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.

13 N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

14 Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha.

15 Onye ọ bula anāchọta, amapue ya; onye ọ bula anējide, ọ da site na mma-agha.

16 Agātupia kwa umu-ha nāṅu ara n'anya-ha; agāpunara ha ulo-ha, merua ndinyom-ha.

17 Le, M'nākpọte ndi Midia imegide ha, ndi nādighi-agu ọla ọcha n'ihe, ọla-edo kwa, ọ dighi-atọ ha utọ.

18 Uta-ha nātupia kwa umu-okorọbia; ha adighi-enwe kwa obi-ebere n'aru nkpuru nke afọ; anya-ha adighi-emekwara umu ebere.

19 Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.

20 Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.

21 Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu.

22 Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n'ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n'ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66