Aisaia 25 IGBOB

1 Jehova, Chinekem ka I bu; m'gēme ka I di elu, m'gēkele aha-Gi; n'ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n'ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu.

2 N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.

3 N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.

4 N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.

5 Dika okpom-ọku n'ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji.

6 Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.

7 Ọzọ, n'ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile.

8 O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

9 Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.

10 N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.

11 Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.

12 Ọzọ, ebe ewusiri ike nke ulo-elu nke mb͕idi-gi nile ka O budaworo, me ka ọ di ala, me ka ọ darue ala, ọbuná rue ájá.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66