Aisaia 50 IGBOB

1 Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.

2 Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.

3 Ejim iji-nji yikwasi elu-igwe dika uwe, ọ bu kwa akwà-nkpe ka M'nēme ka ọ buru ihe-nb͕okwasi-ha.

4 Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.

5 Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.

6 Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.

7 Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.

8 Onye nāgum n'onye ezi omume di nso: ọdi onye mu na ya gēkpe? ka ayi guzo ọtọ n'otù: ònye bu onye ahu nwere okwu-ikpe ikwugidem? ya biakutem nso.

9 Le, Onye-nwe-ayi Jehova gēyerem aka: ònye bu onye ahu gāmam ikpe? le, ha nile gāka dika uwe; nla gērichapu ha.

10 Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.

11 Le, unu nile ndi nāmuye ọku, ndi ji àkú nēre ọku eke onwe-unu n'úkwù dika ihe-ọkiké: jegharinu n'ire ọku-unu, na n'etiti àkú nile nēre ọku unu funwuworo. Ihe a esitewo n'akam diri unu; n'ihe-nwuta ka unu gēdina ala.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52 53 54 55 56 57 58 59 60 61 62 63 64 65 66