2 Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.
3 Ọ gēru kwa, n'ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n'ihe-nb͕u-gi, na n'ihe-nwute-gi, na n'òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya,
4 na i gātu ilu a megide eze Babilon, si, Le, otú onye nāchi n'ihe-ike kwusiworo! le, otú obodo ọla-edo kwusiworo!
5 Jehova anyajiwo nkpa-n'aka nke ndi nēmebi iwu, ndele nke ndi nāchi achi;
6 nke were ntib͕u nēwezugaghi onwe-ya etib͕u ndi nile di iche iche nime nrubiga-ókè nke iwe, nke were nzogbu anēb͕ochighi azọb͕u mba nile n'iwe.
7 Uwa nile ezuwo ike, di jū: ha etiwawo nkpu ọṅù.
8 Ọbuná osisi fir aṅuriwo ọṅu megide gi, ha na osisi cedar nke Lebanon, si, Site na mb͕e i dinaworo, onye-nb͕utu adighi-arigota megide ayi.