9 Ala-mọ site n'okpuru emeworo gi nkpatu izute gi n'ọbibia-gi: ọ nākpọtere gi ndi nādighi ndu, bú nkpi nile nke uwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n'oche-eze-ha bilie.
10 Ha nile gāza, si gi, Gi onwe-gi kwa, èmewo ka i ghara ídi ike dika ayi? ì ghọwo onye yiri ayi?
11 Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.
12 Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile!
13 Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:
14 m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.
15 Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù.