1 Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.
2 O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.
3 Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.
4 Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.
5 Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.