4 N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.
5 N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.
6 Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.
7 O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama.
8 O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n'ulo oké ọhia anya n'ubọchi ahu.
9 Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru.
10 Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike.