1 Ibu eboro Taia.Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.
2 Derenu du, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe.
3 N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche.
4 Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.
5 Mb͕e anuru ihe a n'Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie.
6 Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu.