1 Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.
2 O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma.
3 Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n'agha; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu a.
4 Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa, ndi di elu nke ndi uwa atalatawo.
5 Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.
6 N'ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n'ihi nka ka ndi bi n'uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu.