1 Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:
2 ndi nēje irida n'Ijipt, ma ha ajughi ase n'ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n'ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt!
3 Ma ebe siri ike nke Fero gāghọrọ unu ihere, nb͕abà na ǹdò Ijipt gāghọ-kwa-ra unu itiye n'ọnọdu-ihere.
4 N'ihi na ndi-isi-ya anọwo na Zoan, ndi-ozi-ya nābiaru Hanes.