29 Abù ka unu gēnwe dika n'abali edoworo ememe nsọ; na ọṅù obi, dika nke onye ji ọ̀jà eje ibà n'ugwu Jehova, rue Oké Nkume nke Israel.
30 Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.
31 N'ihi na agēsite n'olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya.
32 Ngabiga ọ bula nke nkpa-n'aka akara àkà, nke Jehova gēme ka ọ dakwasi ya, gādi kwa n'egwú-otiti na n'ubọ-akwara: ọ bu kwa n'agha di iche iche nke nfeghari ka Ọ gēbuso ha agha.