3 Ma ebe siri ike nke Fero gāghọrọ unu ihere, nb͕abà na ǹdò Ijipt gāghọ-kwa-ra unu itiye n'ọnọdu-ihere.
4 N'ihi na ndi-isi-ya anọwo na Zoan, ndi-ozi-ya nābiaru Hanes.
5 Ha nile gēme ihere otù ndi nādighi-abara ha urù, ndi nābughi ihe iye aka, nābughi kwa ihe iba urù, kama ha bu ihe-ihere, ọzọ kwa, ha bu ihe-ita-uta.
6 Ibu eboro anumanu nile nke Negeb.N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.
7 Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n'ihi nka ka M'kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi.
8 Ub͕u a, bata, dekwasi ya na mbadamba íhe n'etiti ha, kà kwa ya n'akwukwọ, ka o we diri ubọchi ọdi-n'iru rue mb͕e nile ebighi-ebi.
9 N'ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova: