18 Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ?
19 Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta.
20 Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.
21 Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya.
22 N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.
23 Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n'agha, bú ihe akwatara n'uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n'agha.