1 Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.
2 N'ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha.
3 Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n'elu, agāb͕aze kwa ugwu site n'ọbara-ha.
4 Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n'osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n'osisi fig.