14 Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe;Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu;Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.
15 Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya:M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.
16 Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu,Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi:I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.
17 Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo:Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam:N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.
18 N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi:Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi.
19 Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta:Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.
20 Jehova ejikerewo izọputam:Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọUbọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.