4 Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari:
5 agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.
6 Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia:
7 ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu.
8 Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
9 Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!
10 Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.