6 Ha yeritara onwe-ha aka n'otù n'otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike.
7 Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya.
8 Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya;
9 gi onye M'jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n'akuku-ya nile ka M'kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju:
10 atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.
11 Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.
12 I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.