1 Biko, ka m'bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n'ugwu ntà nke bu ezi oké ala:
2 o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n'etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia.
3 Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem.
4 Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m'nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m'lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia?