1 Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.
2 Gini mere ọ nācha uhie uhie n'uwe-oyiyi-Gi? gini mere uwe-Gi ji di ka onye nāzọ ukwu n'ebe-inara-manya-vine?
3 Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru.
4 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n'obim, arọ nke ndi M'b͕aputaworo abiawo kwa.