7 Tutu ime eme ya, ọ muru nwa; tutu ihe-nb͕u nke diri ya abia, ọ muputara nwa-nwoke.
8 Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n'otù ubọchi? àgāmu mba n'otù mb͕e? n'ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya.
9 Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M'gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri.
10 Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n'ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n'anya: ka obi tọ unu utọ n'ebe ọ nọ site n'obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya:
11 ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ.
12 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n'akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n'ikperè ka agātughari unu.
13 Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi.