14 Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.
15 Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs.
16 Ọ we chilata àkù nile, ọzọ kwa, Lot, bú nwa-nne-ya, na àkù-ya ka ọ chilatara, ndinyom kwa, na ndi ahu.
17 Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze).
18 Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu.
19 Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:
20 ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n'aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n'uzọ iri nime ihe nile.