15 Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà,
16 je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.
17 Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ.
18 Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n'aka-gi; n'ihi na mba uku ka M'gēme ya ka ọ ghọ.
19 Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.
20 Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n'ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó.
21 O biri n'ọzara Peran: nne-ya we si n'ala Ijipt lutara ya nwunye.