3 Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari.
4 Ka ndim achupuru achupu nọ dika ọbìa n'etiti gi; Moab, ghọrọ ya ebe nzuzo izopu ya n'iru onye nāpunara ya ihe: n'ihi na onye-nkpab͕u nwere ọgwugwu, ihe-ike agwusiwo, ndi nāzọda madu agwuchapuwo n'ala.
5 Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n'ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n'ezi-okwu, n'ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume.
6 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.
7 N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe.
8 N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri.
9 N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.