1 Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù.Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra?
2 Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha.
3 Ndi-ọchi-agha-gi nile ab͕apuwo n'otù, ekere ha ab͕u n'enweghi uta: ndi-gi nile achọtaworo, ekere ha ab͕u n'otù, rue ebe di anya ka ha b͕alagara.
4 N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.
5 N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.
6 Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.
7 O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama.