10 Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n'efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata.
11 Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.
12 Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.
13 N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.
14 Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.
15 N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.
16 Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u.