7 Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.
8 Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.
9 Na nkpuru-obim ka akpiri Gi nātim n'abali; e, mọm nke di nimem ka m'gēji chọsie Gi ike: n'ihi na mb͕e ikpé-Gi nile nādakwasi uwa, ezi omume ka ndi bi n'elu-uwa dum madu bi mutaworo.
10 Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.
11 Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.
12 Jehova, I gēdoro ayi udo: n'ihi na ọ bu kwa ọlu nile nke ayi ka I luworo ayi.
13 Jehova, Chineke-ayi, ndi nwenu ọzọ enwewo ayi, ọ bughi nání Gi; ma ọ bu nání site na Gi ka ayi gēhota aha-Gi.