1 Ahuhu gādiri Eriel, Eriel, bú obodo ebe Devid mara ulo-ikwū-ya! Tukwasinu arọ n'arọ; ka ememe nile b͕agharute na mb͕e-ha:
2 M'gākpab͕u kwa Eriel, ize-ume na isu-ude gādi kwa: o we dirim ka Eriel.
3 M'gāma kwa ulo-ikwūm buruburu megide gi, were ulo-agha nọchigide gi, wulie ihe-nnọchigide-n'agha imegide gi.
4 Ewe me ka i di ala, site n'ala ka i gēkwu, ọ bu kwa n'ájá ka okwu-ọnu-gi gēsi puta, di ala; olu-gi gādi kwa ka onye nāju mọ ihe, ọ gēsi n'ala puta, okwu-ọnu-gi gēsi kwa n'ájá be ka umu-nnunu.