14 n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.
15 Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?
16 Le, ka unu si ekpù ihe iru nke-uku! Ọ̀ bu n'urọ ka agāgu ọkpu-ite? na ihe emere eme gēkwu okwu bayere onye meworo ya, si, O meghm; ma-ọbu na ihe akpuru akpu gēkwu okwu bayere onye kpuworo ya, si, Ọ ghọtaghi.
17 Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?
18 Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.
19 Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel.
20 N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya: