14 Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:
15 gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.
16 Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:
17 n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.
18 N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;
19 na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;
20 na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru;