17 n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.
18 N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;
19 na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;
20 na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru;
21 na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile;
22 na uwe ememe nile, na uwe-nwuda nile, na ákwà-nb͕okwasi nile, na akpa nile;
23 na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n'isi, na ákwà-nb͕ochi nile.